Ka Chineke mere ayi amara, gọzie ayi, Me ka iru-Ya mua n'ebe ayi nọ; Selah Ka ewe mara uzọ-Gi n'uwa, Mara nzọputa-Gi n'etiti mba nile. Ka ndi nile n'uwa kele Gi, Chineke; Ka ndi nile n'uwa kele Gi, ha nile. Ka mba nile ṅuria, ti kwa nkpu ọṅù: N'ihi na I gēkpe ndi nile n'uwa ikpe ziri ezi, Mba nile n'uwa ka I gēdu kwa. Selah Ka ndi nile n'uwa kele Gi, Chineke; Ka ndi nile n'uwa kele Gi, ha nile. Ala emewo ihe-ọmume-ya: Chineke, bú Chineke-ayi, gāgọzi ayi. Chineke gāgọzi ayi; Nsọtu nile nke uwa gātu kwa egwu Ya.
Gụọ ABÙ ỌMA 67
Geere nke a ntị ABÙ ỌMA 67
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: ABÙ ỌMA 67:1-7
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị