M'gēji ọtutu àjà-nsure-ọku ba n'ulo-Gi, M'gākwughachi Gi nkwam nile m'kwere Gi, Nke eb͕ub͕ere-ọnum abua ji saghepu, Nke ọnum kwu-kwa-ra, mb͕e nkpà dirim. Ọtutu àjà-nsure-ọku, bú anu nwere abuba, ka m'gēsurere Gi, Ha na ihe-nsure-ọku nke nēsì ísì utọ nke ebulu; M'gāchu oke-ehi n'àjà, ha na nkpi. Selah Bianu, nuru, unu nile ndi nātu egwu Chineke, M'gākọ kwa akukọ bayere ihe O meworo nkpuru-obim. Ya ka m'jiri ọnum kpọkue, Nbuli-elu di kwa n'okpuru irem. Ọ buru na ọ bu ajọ ihe ka m'leworo anya nime obim, Onye-nwe-ayi agaghi-anu olum: N'ezie Chineke anuwo olum; Ọ ṅawo nti olu ekerem. Onye agọziri agọzi ka Chineke bu, Onye nēwezugaghi ekperem, O sighi kwa n'ebe m'no wezuga ebere-Ya.
Gụọ ABÙ ỌMA 66
Geere nke a ntị ABÙ ỌMA 66
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: ABÙ ỌMA 66:13-20
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ulo
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ
Vidiyo