Tikusienu Chineke nkpu ọǹù ike, uwa nile: Bùanu nsọpuru aha-Ya n'abù ọma: Menu ka otuto-Ya di nsọpuru. Sinu Chineke, Le ka ọlu-Gi nile si di oké egwu! N'uba nke ike-Gi ndi-iro-Gi gērube isi aghugho n'okpuru Gi. Uwa nile gākpọ isi ala nye Gi, Bùku kwa Gi abù ọma; Ha gābùku aha-Gi abù ọma. Selah Jenu, hu ọlu nile nke Chineke; Onye di egwu ka Ọ bu n'omume-Ya n'ebe umu madu nọ. Ọ b͕anwere oké osimiri ka ọ ghọ ala-akọrọ: Ha nāgabiga osimirí n'ukwu-ha: Ka ayi ṅuria nime Ya n'ebe ahu. O ji idi-ike-Ya achi rue mb͕e ebighi-ebi; Anya-Ya abua nēche mba nile nche: Ka ndi nēwezuga onwe-ha ghara ibuli onwe-ha elu. Selah Gọzienu Chineke-ayi, unu ndi nile di iche iche, Me-kwa-nu ka anu olu otuto-Ya: Onye na-etinye nkpuru-obi-ayi nime ndu, Ọ kweghi kwa ka ewezuga ukwu-ayi n'ọnọdu-ha. N'ihi na I nwawo ayi, Chineke: I nuchawo ayi, dika esi anucha ọla-ọcha. I mere ka ayi ma n'ọnyà; I tukwasiwo n'úkwù-ayi ibu nānyib͕u ayi. I mewo ka madu rikwasi inyinya gabiga n'elu isi-ayi; Ayi bàra n'ọku na nime miri; I we me ka ayi puta ba n'inwebiga-ihe-ókè.
Gụọ ABÙ ỌMA 66
Geere nke a ntị ABÙ ỌMA 66
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: ABÙ ỌMA 66:1-12
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ulo
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ
Vidiyo