Naputam n'aka ndi-irom, Chinekem: Me ka m'si n'aka ndi nēbili imegidem nọ n'ebe di elu. Naputam n'aka ndi nālu ajọ ihe, Zọputakwam n'aka ndi-ọbara. N'ihi na, le, ha echewo nkpuru-obim anwu; Ndi di ike nēzukọ imegidem: Ọ bughi n'ihi njehiem, ọ bughi kwa n'ihi nmehiem, Jehova. Mb͕e ọ nādighi ajọ omume m'mere ha nāb͕a ọsọ, dozie onwe-ha: Kpọte Onwe-gi izutem, hu kwa. Gi onwe-gi kwa, Jehova, Chineke nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke Israel, Teta ileta mba nile: Emelera ndi nāghọ aghughọ n'ajọ ihe amara. Selah Ha nālaghachi n'anyasi, nāb͕ọ uja dika nkita, Nāga obodo buruburu. Le, ha ji ọnu-ha nāsuputa okwu; Mma-agha di n'eb͕ub͕ere-ọnu-ha: N'ihi na ònye nānu? bu ihe ha kwuru. Ma Gi onwe-gi, Jehova, gāchì ha ọchì; I gākwa mba nile emò.
Gụọ ABÙ ỌMA 59
Geere nke a ntị ABÙ ỌMA 59
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: ABÙ ỌMA 59:1-8
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ulo
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ
Vidiyo