Onye-nzuzu asiwo n'obi-ya, Ọ dighi Chineke ọ bula di. Ha ebibiwo onwe-ha, ha emewo ka ajọ omume-ha buru ihe-árú; Ọ dighi onye nēme ezi ihe. Chineke siri n'elu-igwe lekwasi umu madu anya, Ihu ma ọ di onye nwere uche, Nke nāchọ Chineke. Ha nile n'otù n'otù alaghachiwo azu; ha ab͕aruwo n'otù dika miri; Ọ dighi onye nēme ezi ihe, ọ dighi ọbuná otù onye. Ndi nālu ajọ ihe, hà amaghi ihe? Bú ndi riworo nri site n'iri ndim, Ma ha akpọkughi Chineke. N'ebe ahu ka ha turu oké egwu, n'ebe oké egwu nādigh: N'ihi na Chineke esesawo ọkpukpu nke onye nāma ulo-ikwū-ya imegide gi; I mewo ka ihere me ha, n'ihi na Chineke ajuwo ha. Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na nzọputa Israel esi na Zaion puta! Mb͕e Chineke gēji me ka ndọta-n'agha ndi-Ya lata, Ka Jekob tegharia egwú ọṅù, ka Israel ṅuria ọǹu.
Gụọ ABÙ ỌMA 53
Geere nke a ntị ABÙ ỌMA 53
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: ABÙ ỌMA 53:1-6
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ulo
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ
Vidiyo