Chineke Nke kachasi chi nile, bú Jehova, ekwuwo, We kpọ uwa site n'ọwuwa anyanwu rue ọdida-ya. Site na Zaion, bú ebe mazuru nma, Ka Chineke nwuputaworo ka ìhè. Ka Chineke-ayi bia, Ya ab͕a-kwa-la nkiti: Ọku nēripia n'iru Ya, Buruburu Ya ka ifufe nēfesi kwa ike nke-uku. Ọ nākpọ elu-igwe nke di n'elu òkù, Nākpọ kwa uwa, ka O we kpe ndi-Ya ikpe: Chikọtaranum ndi-eberem; Bú ndi Mu na ha b͕ara ndu n'elu àjà. Elu-igwe nēgosi kwa ezi omume-Ya; N'ihi na Chineke onwe-ya nēkpe ikpe. Selah Nuru, ndim, M'gēkwu kwa; Nuru, Israel, M'gāb͕a kwa àmà megide gi: Chineke, bú Chineke-gi, ka M'bu. Ọ bughi n'ihi àjà-gi nile ka M'nābara gi nba; Àjà-nsure-ọku-gi nile di kwa n'irum mb͕e nile. M'gaghi-anara oke-ehi n'ulo-gi, M'gaghi-anara nkpi ọ bula n'ogige-ewu-na-aturu-gi. N'ihi na Mu nwe anu-ọhia ọ bula nke oké ọhia, Ya na anu nile n'elu nnù ugwu abua na ọgu iri. Amawom anu-ufe ọ bula nke ugwu nile: Anu nile nke nēnughari n'ọhia di kwa n'akam. Ọ buru na agu aguam, M'gaghi-agwa gi: N'ihi na Mu nwe elu-uwa dum madu bi na ùjú-ya. M'gēri anu oke-ehi? Ọ̀ bu ọbara nkpi ka m'gāṅu? Chuara Chineke ekele dika àjà; Kwughachi kwa Onye kachasi ihe nile elu nkwa nile i kwere: Kpọkukwam n'ubọchi nkpab͕u; M'gādọputa gi, i gāsọpu-kwa-ram.
Gụọ ABÙ ỌMA 50
Geere nke a ntị ABÙ ỌMA 50
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: ABÙ ỌMA 50:1-15
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ulo
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ
Vidiyo