Unu ndi nile di iche iche, kuanu aka; Werenu olu nke iti-nkpu-ọṅu tikue Chineke. N'ihi na Jehova, Onye kachasi ihe nile elu, di egwu; Ọ bu Eze uku nāchi uwa nile. Ọ nēdu ndi nile di iche iche bia n'okpuru ayi, Ọ nēdu kwa mba nile bia n'okpuru ukwu-ayi. Ọ nārọputara ayi ihe-nketa-ayi, Bú nbili-elu nke Jekob, onye Ọ huru n'anya. Selah Chineke ewerewo iti-nkpu rigo, Jehova ewerewo olu opì-ike rigo. Bùkuenu Chineke abù ọma, bùkuenu Ya abù ọma: Bùkuenu Eze-ayi abù ọma, bùkuenu Ya abù ọma. N'ihi na Eze nke uwa dum ka Chineke bu: Bùkuenu Ya abù ọma, maschil. Chineke aghọwo eze mba nile: Chineke anọkwasiwo n'oche-eze nsọ Ya. Ndi amara aha-ha nke ndi nile di iche iche achikọtawo onwe-ha Ibu ndi Chineke nke Abraham: N'ihi na Chineke nwe ọta nile nke uwa; Emewo ka Ọ di elu nke-uku.
Gụọ ABÙ ỌMA 47
Geere nke a ntị ABÙ ỌMA 47
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: ABÙ ỌMA 47:1-9
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ulo
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ
Vidiyo