Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ABÙ ỌMA 44:9-26

ABÙ ỌMA 44:9-26 IGBOB

Ma ub͕u a I juwo ayi aju, we tiye ayi n'ọnọdu-ihere; I dighi-eso kwa usu-ndi-agha-ayi pua ije agha. I nēme ka ayi si n'iru onye-nkpab͕u laghachi azu: Ọzọ, ndi nākpọ ayi asì nāpunara ayì ihe nye onwe-ha. I nēme ayi ka ayi di ka ìgwè aturu agēri eri; N'etiti mba nile ka I fesawo-kwa-ra ayi. I nēre ndi-Gi ma I naraghi ihe-ọnu-ahia, I meghi ka àkù-Gi ba uba site n'ọnu-ahia-ha. I nēme ayi ka ayi ghọro ndi-ab͕ata-obi-ayi ihe-ita-uta, Ka ayi ghọrọ ndi di ayi buruburu ihe-ọchì na ihe-ikwa-emò. I nēme ayi ilu n'etiti mba nile, Nfufe-isi n'etiti ndi nile di iche iche. Ogologo ubọchi nile ka onodu-iherem di n'irum, Ihere irum ekpuchiwokwam, N'ihi olu ita-uta na onye-nkwulu; N'ihi onye-iro na onye nābọ̀ ọ́bọ̀. Ihe nile a abiakwasiwo ayi; ma ayi echezọghi Gi, Ayi ekwughi kwa okwu-ugha n'ọb͕ub͕a-ndu-Gi Obi-ayi alaghachighi azu, Nzọ-ukwu-ayi esighi kwa n'uzọ-Gi wezuga onwe-ha; Na I gwepiawo ayi n'ọnọdu nkita-ọhia, Were kwa onyinyo ọnwu kpuchie ayi. Ọ buru na ayi echezọwo aha Chineke-ayi, We b͕asapuru chi ala ọzọ ọbu-aka-ayi; Chìneke agaghi-egwuputa ala ihe a? N'ihi na Ya onwe-ya mara ihe-nzuzo nile nke obi. N'ezie n'ihi Gi ka eb͕uworo ayi ogologo ubọchi nile; Aguwo ayi dika ìgwè ewu na aturu agēb͕u eb͕u. Teta, n'ìhi gini ka I nāraru ura, Onye-nwe-ayi? Teta n'ura, ajula ayi aju rue mb͕e ebighi-ebi. N'ìhi gini ka I nēzobe iru-Gi? N'ìhi gini ka I nēchezọ nweda-n'ala-ayi na nmeb͕u-ayi? N'ihi na nkpuru-obi-ayi erudawo n'ala rue ájá: Afọ-ayi araparawo n'ala. Bilie iyere ayi aka, B͕aputa kwa ayi n'ihi ebere-Gi.