I nēme ayi ka ayi ghọro ndi-ab͕ata-obi-ayi ihe-ita-uta, Ka ayi ghọrọ ndi di ayi buruburu ihe-ọchì na ihe-ikwa-emò. I nēme ayi ilu n'etiti mba nile, Nfufe-isi n'etiti ndi nile di iche iche. Ogologo ubọchi nile ka onodu-iherem di n'irum, Ihere irum ekpuchiwokwam, N'ihi olu ita-uta na onye-nkwulu; N'ihi onye-iro na onye nābọ̀ ọ́bọ̀. Ihe nile a abiakwasiwo ayi; ma ayi echezọghi Gi, Ayi ekwughi kwa okwu-ugha n'ọb͕ub͕a-ndu-Gi Obi-ayi alaghachighi azu, Nzọ-ukwu-ayi esighi kwa n'uzọ-Gi wezuga onwe-ha; Na I gwepiawo ayi n'ọnọdu nkita-ọhia, Were kwa onyinyo ọnwu kpuchie ayi. Ọ buru na ayi echezọwo aha Chineke-ayi, We b͕asapuru chi ala ọzọ ọbu-aka-ayi; Chìneke agaghi-egwuputa ala ihe a? N'ihi na Ya onwe-ya mara ihe-nzuzo nile nke obi. N'ezie n'ihi Gi ka eb͕uworo ayi ogologo ubọchi nile; Aguwo ayi dika ìgwè ewu na aturu agēb͕u eb͕u. Teta, n'ìhi gini ka I nāraru ura, Onye-nwe-ayi? Teta n'ura, ajula ayi aju rue mb͕e ebighi-ebi. N'ìhi gini ka I nēzobe iru-Gi? N'ìhi gini ka I nēchezọ nweda-n'ala-ayi na nmeb͕u-ayi? N'ihi na nkpuru-obi-ayi erudawo n'ala rue ájá: Afọ-ayi araparawo n'ala. Bilie iyere ayi aka, B͕aputa kwa ayi n'ihi ebere-Gi.
Gụọ ABÙ ỌMA 44
Geere nke a ntị ABÙ ỌMA 44
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: ABÙ ỌMA 44:13-26
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ulo
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ
Vidiyo