Onye ihe nāgara nke-ọma ka ọ bu, bú onye nwere uche n'imeso onye nēnweghi ike: N'ubọchi ihe ọjọ Jehova gēme ka ọ wepuga onwe-ya. Jehova gēdebe ya, me ka ọ di ndu, agēme ka ihe gara ya nke-ọma n'uwa; Enye-kwa-la ya n'aka ọchichọ nkpuru-obi nke ndi-iro-ya. Jehova gākwagide ya n'elu ihe o ji edina mb͕e aru nādighi ya ike: Ihe-ndina-ya nile ka I b͕anweworo n'ọria ya. Mu onwem siri, Jehova, merem amara: Me ka nkpuru-obim diri ndu; n'ihi na emehiewom megide Gi. Ndi-irom nēkwu ihe ọjọ bayerem, si. Òle mb͕e ọ gānwu, aha-ya ewe la n'iyì? Ọ buru kwa na ọ bia ihum, ihe-efu ka ọ nēkwu; Obi-ya nāchikọtara onwe-ya ajọ ihe: Ọ nāpu n'èzí nēkwu ya.
Gụọ ABÙ ỌMA 41
Geere nke a ntị ABÙ ỌMA 41
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: ABÙ ỌMA 41:1-6
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
YouVersion na-eji kuki gasị iji hazie ahụmịhe gị. Site na iji webụsaịtị anyị eme ihe, ị na-anabata ojiji kuki anyị gasị dịka akọwara na Iwu Anyị Mebere Banyere Ihe Ndị Ahụ Gbasara Ndụ Ndị Mmadụ Nke Ha Na-Achọghị Ka Ọha Mara
Ulo
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ
Vidiyo