Jehova, abalaram nba n'iwe-Gi: Adọ-kwa-lam aka na nti n'ọnuma-Gi. N'ihi na àkú-Gi nile efedakwasiwom, Aka-Gi adakwasiwokwam. Ọ dighi izu-okè ọ bula di n'anu-arum n'ihi iwe-Gi; Ọ dighi kwa udo ọ bula di n'ọkpukpum nile n'ihi nmehiem. N'ihi na ajọ omumem nile agabigawo n'elu isim: Dika ibu arọ́ ha dikaram arọ́. Ufiri-utalim nile nēsì ísì, nāb͕u kwa miri, N'ihi uchem b͕agọro ab͕agọ. Ab͕agọrọm ab͕agọ ruda kwa nke-uku; Ogologo ubọchi nile ka m'jeghariworo nēyi uwe-nkpe. N'ihi na úkwùm juputara na nruru-ọku; Ọ dighi kwa izu-okè ọ bula di n'anu-arum. Arum esinwuwo, egwepiawokwam nke-uku: Ab͕ọwom uja n'ihi isu-ude nke obim. Onye-nwe-ayi, n'iru Gi ka ichọsi-ikem nile di; Ize-umem ezonarighi kwa Gi. Obim nēti ike ike, ikem esiwo nimem la: Ìhè nke anyam abua kwa, ọbuná ìhè nke anyam ahu adighi n'arum. Ndi nāhum n'anya na ndi-eyìm nēguzo iche na ncherita-iru ihe-otitim; Ndi-ab͕ata-obim nēguzo kwa n'ebe di anya. Ndi nāchọsi nkpuru-obim ike nēsi-kwa-ram ọnyà; Ndi nāchọ imem ihe ọjọ ekwuwo kwa ihe-ila-n'iyì di iche iche, Ọ bu kwa ihe-aghughọ nile ka ha nātughari n'uche ogologo ubọchi nile.
Gụọ ABÙ ỌMA 38
Geere nke a ntị ABÙ ỌMA 38
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: ABÙ ỌMA 38:1-12
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ulo
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ
Vidiyo