Merem amara, Jehova, n'ihi na anọm na nkpab͕u: Anyam emebiwo nime nkpasu-iwem, ya na nkpuru-obim, na afọm, dika uwe nla mebiri. N'ihi na ndum agwusiwo n'iru-újú, na arọm nile n'ize-ume: Ikem asuwo ngọngọ site n'ajọ omumem, ọkpukpum nile emebiwo kwa, dika uwe nla mebiri. N'ihi ndi-nkpab͕um nile aghọwom ihe-ita-uta nke-uku, Ọbuná n'ebe ndi-ab͕ata-obim nọ aghọwo-kwa-ram ndi m'mara oké egwu: Ndi nāhum n'èzí ab͕anariwom. Echezọwo mu onwem dika onye nwuru anwu puru n'obi madu: Aghọwom ihe nāla n'iyì. N'ihi na anuwom akukọ ọjọ nke ọtutu madu, Ujọ dim buruburu: Mb͕e ha nāb͕a ìzù n'otù imegidem, Ha zubere iwepu ndum. Ma mu onwem, ọ bu Gi ka m'tukwasiworo obi, Jehova: Asiwom, Chinekem ka I bu. N'aka-Gi ka mb͕em nile di: Naputam n'aka ndi-irom, na n'aka ndi nēsob͕um. Me ka iru-Gi nye orù-gi ìhè: Zọputam n'ihi ebere-Gi. Jehova, ekwela ka ihere mem; n'ihi na akpọkuwom I: Ka ihere me ndi nēmebi iwu, ka ha debe ọnu-ha du n'ala-mọ. Ka eb͕ub͕ere-ọnu okwu-ugha da ob͕i; Nke nēkwu oké okwu megide onye ezi omume, Nime npako na nleda-anya.
Gụọ ABÙ ỌMA 31
Geere nke a ntị ABÙ ỌMA 31
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: ABÙ ỌMA 31:9-18
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị