Nime Gi, Jehova, ka m'b͕abàworo; ekwela ka ihere mem rue mb͕e ebighi-ebi: N'ezi omume-gi me ka m'b͕apu. Tọrọm nti-Gi n'ala; naputam ngwa ngwa: Ghọrọm oké nkume nke ebe siri ike, bú ulo nke ebe ewusiri ike nke-uku izọputam. N'ihi na nkumem di elu na ebem ewusiri ike ka I bu; Ọzọ, n'ihi aha-Gi I gēdum, dukwam nwayo. I gēme ka m'si n'ub͕u nke ha zoberem puta; N'ihi na Gi onwe-gi bu ebem siri ike. N'aka-Gi ka m'nēnye mọm idebe: I b͕aputawom, Jehova, Chineke nke ezi-okwu. Akpọwom ha asì, bú ndi nāriba ihe-efu nile nke nābughi ihe ama: Ma mu onwem atukwasiwo obi na Jehova. Ka m'tegharia egwú ọṅu, ṅuri kwa ọṅu, n'ebere-Gi: N'ihi na I huwo nweda-n'alam; I mawo nkpuru-obim n'ahuhu di iche iche: I mechibidoghkwam nye n'aka onye-iro; I mewo ka ukwum abua guzo n'ebe sara mbara. Merem amara, Jehova, n'ihi na anọm na nkpab͕u: Anyam emebiwo nime nkpasu-iwem, ya na nkpuru-obim, na afọm, dika uwe nla mebiri. N'ihi na ndum agwusiwo n'iru-újú, na arọm nile n'ize-ume: Ikem asuwo ngọngọ site n'ajọ omumem, ọkpukpum nile emebiwo kwa, dika uwe nla mebiri. N'ihi ndi-nkpab͕um nile aghọwom ihe-ita-uta nke-uku, Ọbuná n'ebe ndi-ab͕ata-obim nọ aghọwo-kwa-ram ndi m'mara oké egwu: Ndi nāhum n'èzí ab͕anariwom. Echezọwo mu onwem dika onye nwuru anwu puru n'obi madu: Aghọwom ihe nāla n'iyì. N'ihi na anuwom akukọ ọjọ nke ọtutu madu, Ujọ dim buruburu: Mb͕e ha nāb͕a ìzù n'otù imegidem, Ha zubere iwepu ndum.
Gụọ ABÙ ỌMA 31
Geere nke a ntị ABÙ ỌMA 31
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: ABÙ ỌMA 31:1-13
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ulo
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ
Vidiyo