Nyenu Jehova, unu umu Chineke, Nyenu Jehova nsọpuru na ike. Nyenu Jehova nsọpuru aha-Ya; Kpọnu isi ala nye Jehova n'ima-nma nke idi-nsọ. Olu Jehova di n'elu miri: Chineke nke ebube nāma éb͕è-elu-igwe, Jehova nọ n'elu ọtutu miri. Olu Jehova nāda n'ike; Olu Jehova nāda n'ima-nma. Olu Jehova nētiwa osisi cedar; Jehova we tiwasia osisi cedar nke Lebanon. Ọ nēme ka ha nāwuli elu dika nwa-ehi; Bú Lebanon na Siron, dika nwa-atu. Olu Jehova nāwaputa ire ọku. Olu Jehova nēme ka ọzara me nkpatu; Jehova nēme ka ọzara Kedesh me nkpatu. Olu Jehova nēme ka ime nēme nne-ele, Ọ nāb͕uchapu kwa akwukwọ osisi oké ọhia: Ọzọ n'ulo uku Ya ihe hile nāsi, Ebube. Jehova nọduru n'oche-eze n'Iju-miri ahu; Jehova we nọdu dika eze rue mb͕e ebighi-ebi. Jehova gēnye ndi-Ya ike; Jehova gēji udo gọzie ndi-Ya.
Gụọ ABÙ ỌMA 29
Geere nke a ntị ABÙ ỌMA 29
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: ABÙ ỌMA 29:1-11
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị