Gi, Jehova, ka m'nākpọku; Oké nkumem, echila nti n'ebe m'nọ: Ka I we ghara ib͕am nkiti, M'we yie ndi nārida n'olùlù. Nuru olu aririọ-amaram nile mb͕e m'tikuru Gi, Mb͕e m'chiliri akam abua n'ebe ime-ime-ulo nke ebe nsọ Gi di. Adọkpurulam tiyere ndi nēmebi iwu, Tiye-kwa-ra ndi nālu ajọ ihe; Ndi nāgwa madu-ibe-ha okwu udo, Ma ihe ọjọ di n'obi-ha. Nye ha dika ọlu-ha si di, na dika ijọ-njọ nke nmeso nile ha si di: Nye ha dika aka-ha si eme; Nyeghachi ha ihe ha mere. N'ihi na ha adighi-aghọta ọlu nile nke Jehova, Na n'ihi na ha adighi-aghọta ihe aka-Ya abua meworo, Ọ gākwada ha, Ọ gaghi-ewulita ha elu dika ulo. Onye agọziri agọzi ka Jehova bu, N'ihi na Ọ nuwo olu aririọ-amaram nile. Jehova bu ikem na ọtam; Ya ka obim tukwasiworo obi, eyewo-kwa-ram aka: Obim we nāwuli elu n'ọṅù; M'gēsite kwa n'abùm kele Ya. Jehova buru ya ike, Ebe siri ike nke nzọputa nke onye nke Ya etere manu ka Ọ bu. Zọputa ndi-Gi, gozi kwa ihe-nketa-Gi: Nāzù kwa ha dika aturu, nēku kwa ha n'aka-Gi rue mb͕e ebighi-ebi.
Gụọ ABÙ ỌMA 28
Geere nke a ntị ABÙ ỌMA 28
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: ABÙ ỌMA 28:1-9
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị