Ọtutu oke-ehi dim buruburu: Oke-ehi di ike nke Beshan ab͕awom buruburu. Ha asaghepuwo ọnu-ha n'arum, Dika ọdum nke nādọb͕u anu, nke nāb͕ọ kwa uja. Dika miri ka awusiworom, Ọkpukpum nile ekesawo onwe-ha: Obim aghọwo ihe dika wax; Ọ lọwo miri n'etiti afọm. Ikem akpọwo nku di ka osisi; Irem nārapara kwa n'ab͕am; Ọ bu kwa n'ájá ọnwu ka I nātọb͕ọm. N'ihi na nkita dim buruburu: Nzukọ ndi nēme ihe ọjọ ab͕awom buruburu; Ha nādupú akam abua na ukwum abua. Anamagu ọkpukpum nile ọnu; Ndi ahu nēlegide nēlekwam anya: Ha nēkère onwe-ha uwem, N'elu ihe m'nēyi n'aru ka ha nēfe kwa nzà. Ma Gi onwe-gi, Jehova, anọla n'ebe di anya: Gi ikem, bia ọsọsọ iyerem aka. Naputa nkpuru-obim na mma-agha; Naputa nkpuru-obi m'nwere nání ya náka nkita. Zọputam n'ọnu ọdum; Ọzọ, site na mpi atu ka I zaworom. Agamakọrọ umu-nnem aha-Gi: N'etiti nkpọkọta-Gi ka m'gēto Gi. Ndi nātu egwu Jehova, tonu Ya; Unu nile, bú nkpuru nke Jekob, sọpurunu Ya; Tu-kwa-nu ujọ Ya, unu nkpuru nile nke Israel. N'ihi na O ledaghi nweda-n'ala nke onye ewedara n'ala anya, Ọ kpọghi kwa ya ihe-árú; O zonarighi kwa ya iru-Ya; Ma mb͕e o tikuru Ya, Ọ nuru olu-ya. N'ebe I nọ ka otutom si bia nime nkpọkọta-Gi bara uba: M'gākwughachi nkwam nile n'iru ndi nātu egwu Ya. Ndi di ume-ala n'obi gēri ihe, riju kwa afọ: Ha gēto Jehova, bú ndi nāchọ Ya: Ka obi-unu di ndu rue mb͕e ebighi-ebi. Nsọtu nile nke uwa gēcheta, laghachikute kwa Jehova: Ab͕uru nile nke mba nile gākpọ kwa isi ala n'iru Gi. N'ihi na ọ bu Jehova nwe ala-eze: Ọ nāchi kwa mba nile. Ndi bara uba nile nke uwa gēri ihe, kpọ kwa isi ala: N'iru Ya ka ndi nile ndi nārida n'ájá gēruru ala, Ha na onye nēdebeghi nkpuru-obi-ya ndu. Otù nkpuru gēfè Ya òfùfè; Agākọrọ ọb͕ọ ọzọ akukọ a bayere Onye-nwe-ayi. Ha gābia gosi otù ndi agàmuputa n'iru ezi omume-Ya, Na O mewo ya.
Gụọ ABÙ ỌMA 22
Geere nke a ntị ABÙ ỌMA 22
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: ABÙ ỌMA 22:12-31
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị