Chinekem, Chinekem, n'ìhi gini ka I rapurum? N'ìhi gini ka I nọ m n'ebe di nzọputam na okwu nile nke ọb͕ub͕ọ-ujam anya? Chinekem, anamakpọ òkù n'ehihie, ma I dighi-aza; N'abali kwa, ma ọ dighi inọ-jū m'nwere. Ma Gi onwe-gi di nsọ, Gi Onye nānọkwasi n'otuto nile nke Israel dika oche-eze. Na Gi ka nna-ayi-hà tukwasiri obi: Ha tukwasiri obi, I we me ka ha b͕apu. Gi ka ha tikuru, eme-kwa-ra ka ha wepuga onwe-ha: Na Gi ka ha tukwasiri obi, ihere emeghi kwa ha. Ma mu onwem bu idide, ọ bughi kwa madu ka m'bu; Abum ihe-ita-uta nke mmadu, na onye ndim neleda anya. Ndi nile ndi nāhum nāchìm ọchi: Ha na-enu ọnu, fufè isi, si, Turu onwe-gi rue Jehova aru; Ya me ka ọ b͕apu: Ya naputa ya, n'ihi na ihe-ya atọwo Ya utọ. Otú ọ di, Gi onwe-gi bu onye meworo ka m'waputa n'afọ nnem: I nēme ka m'tukwasi obi mb͕e m'nọ nara nnem. Na Gi ka atukwasirim site n'àkpà-nwa: Site n'afọ nnem ka Gi onwe-gi bu Chinekem. Anọlam n'ebe dí anya; n'ihi na nkpab͕u di nso; N'ihi na ọ dighi onye nēyerem aka.
Gụọ ABÙ ỌMA 22
Geere nke a ntị ABÙ ỌMA 22
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: ABÙ ỌMA 22:1-11
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị