Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ABÙ ỌMA 18:16-36

ABÙ ỌMA 18:16-36 IGBOB

O si n'elu zìe, kurum, Dọputam n'ọtutu miri. Ọ nānaputam n'aka onye-irom di ike, Na n'aka ndi nākpọm asì, n'ihi na ha nwere ume karim. Ha nābia n'irum n'ubọchi nhuju-anyam: Ma Jehova burum ihe-ndabere. O we me ka m'puta rue ebe sara mbara; Ọ nādọputam, n'ihi na ihem tọrọ Ya utọ. Jehova nēnyeghachim dika ezi omumem si di; Dika idi-ọcha akam abua si di, otú a ka O nēmeghachim ọzọ. N'ihi na edebewom uzọ nile nke Jehova, Emebighikwa m iwu n'ipu n'aka Chinekem. N'ihi na ikpé-Ya nile di n'irum, Ukpuru-Ya kwa, adighm-ewezuga ha n'ebe m'nọ. M'we zue okè n'ebe Ọ nọ, Edebe-kwa-ram onwem pua n'ajo omumem. Jehova we meghachim dika ezi omumem si di, Dika idi-ọcha akam abua n'anya-Ya si di. N'ebe onye-ebere nọ I gēgosi Onwe-gi onye-ebere; N'ebe nwoke zuru okè nọ I gēgosi Onwe-gi onye zuru okè; N'ebe onye di ọcha nọ I gēgosi Onwe-gi onye di ọcha; Ma n'ebe onye b͕agọro ab͕agọ nọ I gēgosi Onwe-gi onye-nb͕á. N'ihi na Gi onwe-gi gāzọputa ndi ewedara n'ala; Ma anya npako, I gēme ka ha di ala. N'ihi na Gi onwe-gi gāmuye oriọnam: Jehova, bú Chinekem, nēme kwa ka ọchichirim nwue enwu. N'ihi na m'nēsite na Gi b͕a ọsọ ichu usu ndi nāpunara madu ihe; Anamesite kwa na Chinekem wubiga mb͕idi. Chineke, uzọ-Ya zuru okè: Okwu-ọnu Jehova bu ihe anuchara anucha; Ọta ka Ọ buru ndi nile nke nāb͕abà nime Ya. N'ihi na ònye bu Chineke, ma-ọbughi Jehova? Ònye bu kwa oké nkume, ma-ọbughi Chineke-ayi? Ọ bu Chineke Nke ji ike kem dika ihe-ọkiké, Ọ nēme kwa ka uzọm zue okè. O nēdozi ukwum ka ha di ka ukwu nne-ele: N'elu ebem di elu ka O nēguzokwam. O nēzi akam abua ibu agha; Ogwe-akam abua nārọgọ kwa uta ọla. I nyewokwam ọta nzọputa-Gi: Aka-nri-Gi nākwagidekwam, Ume-ala-n'obi nke Gi nēmekwam ka m'ba uba. I nēme ka nzọ-ukwum sa mbara n'okpurum, Nkwonkwo-ukwum ab͕uchapughi kwa.