Anamahu Gi n'anya nke-uku, Jehova, bú ikem.
Jehova bu nkumem di elu, na ebem ewusiri ike, na onye nēme ka mb͕apu;
Ọ bu Chinekem, na oké nkumem, anamab͕abà nime Ya;
Ọ bu ọtam, na mpi nke nzọputam, na ulo-elum.
Onye anēto eto ka Ọ bu, anamakpọku Jehova:
Ewe zọputam n'aka ndi-irom.
Udọ̀ nile nke ọnwu b͕aram buruburu,
Miri-iyi nile nke ihe jọb͕uru onwe-ya nēme kwa ka m'tua egwu.
Udọ̀ nile nke ala-mọ dim buruburu:
Ọnyà nile nke ọnwu biara n'irum.
Anamakpọku Jehova nime nkpà kparam,
Ọ bu Chinekem ka m'nētiku:
O nēsi n'ulo uku Ya nu olum,
Nkpu m'tikuru Ya we ba na nti-Ya abua.
Ala we me nkpatu ma kwa jijiji,
Ntọ-ala nile nke ugwu nile nāma kwa jijiji,
Ewe me ka ha me nkpatu, n'ihi na iwe-Ya di ọku.
Anwuru-ọku rigoro n'imi-Ya,
Ọku nēsi kwa n'ọnu-Ya ripia:
Afunwuru icheku site na ya.
O rulata-kwa-ara elu-igwe, rida;
Oké ọchichiri di kwa n'okpuru ukwu-Ya abua.
O we nọkwasi n'elu cherub dika inyinya, we felie:
O we fesie ike n'elu nkù ìfùfè.
Ọ nēdo ọchichiri ka ọ buru ebe-nzuzo-Ya, ka ọ buru ulo-ntu-Ya nke di Ya buruburu;
Bú ọchichiri miri, igwe-oji b͕ara ọchichiri nke mbara-ígwé.
Site n'onwunwu nke nēnwu n'iru Ya igwe-oji-Ya nile nke b͕ara ochichiri gabigara,
Akú-miri-ígwé na icheku ọku.
Jehova we ma éb͕è-elu-igwe n'elu-igwe,
Onye kachasi ihe nile elu nēme kwa ka olu-Ya da;
Ákú-miri-ígwé na icheku ọku.
O we b͕a àkú-Ya, me ka ha b͕asa;
Ọtutu àmùmà kwa, O we chusa ha.
Ewe hu ebe nile miri si erù,
Anēkpughe kwa ntọ-ala nile nke elu-uwa dum madu bi,
Site n'ibasi-nba-ike-Gi, Jehova,
Site nume nke iku-ume nke imi-Gi.
O si n'elu zìe, kurum,
Dọputam n'ọtutu miri.
Ọ nānaputam n'aka onye-irom di ike,
Na n'aka ndi nākpọm asì, n'ihi na ha nwere ume karim.
Ha nābia n'irum n'ubọchi nhuju-anyam:
Ma Jehova burum ihe-ndabere.
O we me ka m'puta rue ebe sara mbara;
Ọ nādọputam, n'ihi na ihem tọrọ Ya utọ.
Jehova nēnyeghachim dika ezi omumem si di;
Dika idi-ọcha akam abua si di, otú a ka O nēmeghachim ọzọ.
N'ihi na edebewom uzọ nile nke Jehova,
Emebighikwa m iwu n'ipu n'aka Chinekem.
N'ihi na ikpé-Ya nile di n'irum,
Ukpuru-Ya kwa, adighm-ewezuga ha n'ebe m'nọ.
M'we zue okè n'ebe Ọ nọ,
Edebe-kwa-ram onwem pua n'ajo omumem.
Jehova we meghachim dika ezi omumem si di,
Dika idi-ọcha akam abua n'anya-Ya si di.
N'ebe onye-ebere nọ I gēgosi Onwe-gi onye-ebere;
N'ebe nwoke zuru okè nọ I gēgosi Onwe-gi onye zuru okè;
N'ebe onye di ọcha nọ I gēgosi Onwe-gi onye di ọcha;
Ma n'ebe onye b͕agọro ab͕agọ nọ I gēgosi Onwe-gi onye-nb͕á.
N'ihi na Gi onwe-gi gāzọputa ndi ewedara n'ala;
Ma anya npako, I gēme ka ha di ala.
N'ihi na Gi onwe-gi gāmuye oriọnam:
Jehova, bú Chinekem, nēme kwa ka ọchichirim nwue enwu.
N'ihi na m'nēsite na Gi b͕a ọsọ ichu usu ndi nāpunara madu ihe;
Anamesite kwa na Chinekem wubiga mb͕idi.
Chineke, uzọ-Ya zuru okè:
Okwu-ọnu Jehova bu ihe anuchara anucha;
Ọta ka Ọ buru ndi nile nke nāb͕abà nime Ya.
N'ihi na ònye bu Chineke, ma-ọbughi Jehova?
Ònye bu kwa oké nkume, ma-ọbughi Chineke-ayi?
Ọ bu Chineke Nke ji ike kem dika ihe-ọkiké,
Ọ nēme kwa ka uzọm zue okè.