Debem, Chineke: n'ihi na ab͕abàwom nime Gi. Asiwom Jehova, Onye-nwem ka I bu: Ọdi-nmam adighi-eru Gi aru. Asiwokwam ndi nsọ ndi nọ n'uwa, Na ndi di ebube nke ọ bu nání ihe-ha nātọm utọ: Ihe-nb͕u-ha gāba uba, bú ndi were chi ọzọ n'ọnọdu Jehova: M'gaghi-awusi àjà-ihe-ọṅuṅu-ha nke ọbara, M'gaghi-eburu kwa aha-ha n'elu eb͕ub͕ere-ọnum. Jehova bu òkè nke ihe m'ketara na ìkom: Gi onwe-gi nējide ihe rurum n'ife-nzà. Udọ̀-ọtùtù nile adaworom n'ebe di utọ; N'ezie ihe-nketam dim ezi nma. M'gāgọzi Jehova, Onye duworom ọdu: Ọzọ, akurum abua nādọm aka na nti n'abali nile. Edowom Jehova n'irum mb͕e nile: N'hi na Ọ nọ n'aka-nrim, agaghi-ewzugam n'ọnọdum. N'ihi nka obim aṅuriwo ọṅu, nsọpurum eteghariwo kwa egwú ọṅù: Ọzọ anu-arum gēbi na ntukwasi-obi. N'ihi na I gaghi-arapuru ala-mọ nkpuru-obim; I gaghi-enye onye-ebere-Gi ka ọ hu nbibi. I gēme ka m'mara uzọ ndu: Ojuju-afọ ọṅù di n'iru Gi; E! utọ di iche iche di n'aka-nri-Gi ebighi-ebi.
Gụọ ABÙ ỌMA 16
Geere nke a ntị ABÙ ỌMA 16
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: ABÙ ỌMA 16:1-11
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị