Gi Jerusalem, nāja Jehova; To Chineke-gi, Zaion. N'ihi na O mewo ka ihe-ntuchi nile nke ọnu-uzọ-ama-gi nile di ike; Ọ gọziwo umu-gi n'etiti gi. Ọ bu onye nēme ka ókè-ala-gi ghọ udo; Abuba ọka wheat ka O ji me ka i riju afọ. Ọ bu onye nēzisa okwu-ọnu-Ya n'uwa; Ngwa ngwa ka okwu-Ya nāb͕a ọsọ. Ọ bu onye nēnye snow dika aji-anu; Ọ nēfesa hoar-frost dika ntu. Ọ nātupu ice-Ya dika iberibe achicha: Ònye gēguzo n'iru oyi-Ya? Ọ nēzipu okwu-Ya, we b͕aze ha: Ọ nēme ka ifufe-Ya fe, miri we rùe. Ọ nēgosi Jekob okwu-Ya, Nēgosi kwa Israel ukpuru-Ya nile na ikpé-Ya nile. O mesoghi mba ọ bula otú a: Ma ikpé-Ya nile, ha amaghi ha. Tonu Ja.
Gụọ ABÙ ỌMA 147
Geere nke a ntị ABÙ ỌMA 147
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: ABÙ ỌMA 147:12-20
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị