M'gēme Gi ka I di elu, Chinekem, bú Eze; M'gāgọzi kwa aha-Gi rue mb͕e nile ebighi-ebi. Kwa-ubọchi ka m'gāgọzi Gi; M'gēto kwa aha-Gi rue mb͕e nile ebighi-ebi. Onye uku ka Jehova bu, Ọ bu kwa onye anēto nke-uku; Ọ dighi kwa ngwuputa-ala diri idi-uku-Ya. Otù ọb͕ọ gāja ọlu-Gi nile na nti ọb͕ọ ọzọ, We gosi idi-ike-Gi nile. N'ima-nma nke nsọpuru nke ebube-Gi, Na n'oké ọlu-Gi nile, ka m'gātughari uche. Ọ bu kwa ike nke ọlu-Gi nile di egwu ka ha gēkwuputa; Ọ bu kwa idi-uku-Gi ka m'gākọ akukọ-ya. Ncheta nke iba-uba nke idi-nma-Gi ka ha ga-ekwukwa, Ọ bu kwa ezi omume-Gi ka ha gēti nkpu ọṅù bayere ya.
Gụọ ABÙ ỌMA 145
Geere nke a ntị ABÙ ỌMA 145
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: ABÙ ỌMA 145:1-7
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị