Onye-nzuzu asiwo n'obi-ya, Ọ dighi Chineke ọ bula di. Ha ebibiwo onwe-ha, ha emewo ka omume-ha buru ihe-árú; Ọ dighi onye nēme ezi ihe. Jehova siri n'elu-igwe lekwasi umu madu anya, Ihu ma ọ di onye nwere uche, Nke nāchọ Chineke. Ha nile ewezugawo onwe-ha; ha ab͕aruwo n'otù dika miri; Ọ dighi onye nēme ezi ihe, ọ dighi ọbuná otù onye. Ndi nile nālu ajọ ihe, hà amaghi ihe? Bú ndi riworo nri site na-iri ndi m, Ma ha akpọkughi Jehova. N'ebe ahu ka ha turu oké egwu; N'hi na Chineke nọ n'ọb͕ọ onye ezi omume. Unu nēme ndum-ọdu nke onye ewedara n'ala ka ọ buru ihe-ihere, N'ihi na Jehova bu ebe-nb͕abà-ya. Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na nzọputa Israel esi na Zaion puta! Mb͕e Jehova gēji me ka ndọta-n'agha ndi-Ya lata, Ka Jekob tegharia egwú ọṅù, ka Israel ṅuria ọṅu.
Gụọ ABÙ ỌMA 14
Geere nke a ntị ABÙ ỌMA 14
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: ABÙ ỌMA 14:1-7
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ulo
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ
Vidiyo