Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ABÙ ỌMA 139:1-24

ABÙ ỌMA 139:1-24 IGBOB

Jehova, I gwuputawo ala obim, I we maram. Gi onwe-gi amawo nnọdu-alam na nbili-ọtọm, I nāghọta èchìchèm nile site n'ebe di anya. Okporo-uzọm na ndina-alam ka I fùchaworo dika ọka, Ọ bu kwa uzọm nile ka I maworo nke-ọma. N'ihi na ọ dighi okwu di n'irem, Ma, le, Jehova, I machasiwo ya. N'azu na n'iru ka I nọchigideworom, we tukwasi ọbu-aka-Gi n'arum. Ọmuma-ihe di otú a dikaririm ebube; Ọ dika elu, apughm iru ya. Òle ebe m'gālanari Mọ-Gi? Ma-ọbu òle ebe m'gēsi n'iru Gi b͕alaga? Ọ buru na arigom n'elu-igwe, n'ebe ahu ka I nọ: Ọ buru kwa na ab͕asam utem n'ala-mọ, le, I nọ n'ebe ahu. Ọ buru na achirim nkù nke ututu, Biri n'akuku dikarisiri anya nke oké osimiri, Ọbuná n'ebe ahu ka aka-Gi gēdurum, Aka-nri-gi gējidekwam. M'we si, N'ezie, ọchichiri gēkpuchim; Ma abali ghọrọ ìhè buruburum. Ọbuná ọchichiri adighi-ab͕achiri Gi; Ma abali nēnye ìhè dika ehihie: Dika ọchichiri si di, otú a ka ìhè di n'anya-Gi N'ihi na Gi onwe-gi enwetawo akurum abua: I nākpam n'afọ nnem dika esi ákpa ákwà. M'gēkele Gi; n'ihi na ejiwo ihe di iche iche di egwu me ka m'buru oké ọlu: Oké ọlu ka ọlu-Gi nile di; Nkpuru-obim ma-kwa-ra ya nke-ọma. Ọkpukpum ezopughi n'anya-Gi, Mb͕e emerem na nzuzo, Mb͕e adurum nke-ọma, dika onye-ọ̀kà-ọdudu-ákwà si adu, n'ebe nile di ala nke uwa. Anya-Gi abua huru arum mb͕e o kēzughi okè, Ọ bu kwa n'akwukwọ-Gi ka edere ihe nile dim n'aru, Nke akpuru kwa-ubọchi, Mb͕e ọ dighi otù ihe di nime ha. Le ka èchìchè-Gi nile si di oké ọnu-ahia n'anyam, Chineke! Le ka ọnu-ọgugu nile ha si di uku ri nne! Ọ buru na aguam ha ọnu, ha bara uba kari ájá: Mb͕e m'tetaworo, mu na I nānọgide. Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na I b͕ue onye nēmebi iwu, Chineke: Ya mere, unu ndi-ọbara, sinu n'ebe m'nọ wezuga onwe-unu. Ha bu ndi nēkwu okwu megide Gi nime nzube ọjọ, Ndi ebuliworo nye ihe-efu ka ndi-iro-Gi bu. Ọ̀ bughi ndi nākpọ Gi asì, jehova, ka m'nākpọ asì? Ọ̀ bughi kwa ndi nēbili imegide Gi ka m'nāsọ oyi? Ọ bu ikpọ-asì nke zuru okè ka m'ji kpọ ha asì: Ndi-iro ka ha burum. Gwuputa ala obim, Chineke, we mara obim: Nānwam, we mara iche-uchem nile: Hu kwa ma ọ di uzọ ọ bula nēweta ihe-nb͕u di nimem, Durukwam n'uzọ ebighi-ebi.

Atụmatụ Ihe Ọgụgụ Gasị Dị N’efu na Ihe Ofufe Gasị metụtara ABÙ ỌMA 139:1-24

YouVersion na-eji kuki gasị iji hazie ahụmịhe gị. Site na iji webụsaịtị anyị eme ihe, ị na-anabata ojiji kuki anyị gasị dịka akọwara na Iwu Anyị Mebere Banyere Ihe Ndị Ahụ Gbasara Ndụ Ndị Mmadụ Nke Ha Na-Achọghị Ka Ọha Mara