Jehova, I gwuputawo ala obim, I we maram. Gi onwe-gi amawo nnọdu-alam na nbili-ọtọm, I nāghọta èchìchèm nile site n'ebe di anya. Okporo-uzọm na ndina-alam ka I fùchaworo dika ọka, Ọ bu kwa uzọm nile ka I maworo nke-ọma. N'ihi na ọ dighi okwu di n'irem, Ma, le, Jehova, I machasiwo ya. N'azu na n'iru ka I nọchigideworom, we tukwasi ọbu-aka-Gi n'arum. Ọmuma-ihe di otú a dikaririm ebube; Ọ dika elu, apughm iru ya. Òle ebe m'gālanari Mọ-Gi? Ma-ọbu òle ebe m'gēsi n'iru Gi b͕alaga? Ọ buru na arigom n'elu-igwe, n'ebe ahu ka I nọ: Ọ buru kwa na ab͕asam utem n'ala-mọ, le, I nọ n'ebe ahu. Ọ buru na achirim nkù nke ututu, Biri n'akuku dikarisiri anya nke oké osimiri, Ọbuná n'ebe ahu ka aka-Gi gēdurum, Aka-nri-gi gējidekwam. M'we si, N'ezie, ọchichiri gēkpuchim; Ma abali ghọrọ ìhè buruburum. Ọbuná ọchichiri adighi-ab͕achiri Gi; Ma abali nēnye ìhè dika ehihie: Dika ọchichiri si di, otú a ka ìhè di n'anya-Gi
Gụọ ABÙ ỌMA 139
Geere nke a ntị ABÙ ỌMA 139
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: ABÙ ỌMA 139:1-12
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ulo
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ
Vidiyo