M'gēji obim nile kele Gi: N'iru chi nile ka m'agābùku Gi abù ọma. M'gākpọ isi ala n'ebe ulo uku nsọ Gi di, M'gēkele kwa aha-Gi n'ihi ebere-Gi na n'ihi ezi-okwu-Gi: N'ihi na I mewo ka okwu-ọnu-Gi di uku n'elu aha-Gi nile. N'ubọchi m'kpọkuru Gi ka I zaram, I nēji ike di na nkpuru-obim kpaliem. Eze nile nke uwa gēkeli Gi, Jehova, N'ihi na ha anuwo okwu nile nke ọnu-Gi. Ha gābù kwa abù bayere uzọ nile nke Jehova; N'ihi na ebube Jehova di uku. N'ihi na Jehova di elu, ma ọ bu onye di ume-ala n'obi ka Ọ nāhu anya: Ma onye-npako, Ọ nēsite n'ebe di anya mara ya. Ọ buru na ejeghariam n'etiti ahuhu, I gēme ka m'di ndu; I gēseti aka-Gi imegide iwe ndi-irom, Aka-nri-Gi gāzọputakwam. Jehova gēmezurum ihe nile: Jehova, ebere-Gi nādiru mb͕e ebighi-ebi; Arala aka n'ọlu nile nke aka-gi abua.
Gụọ ABÙ ỌMA 138
Geere nke a ntị ABÙ ỌMA 138
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: ABÙ ỌMA 138:1-8
3 Days
Do you deeply feel your need for Jesus? This three-day plan for prayer is designed to enhance your time alone with Him and help you cry out to Him. It also serves as a companion prayer to the eight-part "Jesus, I Need You" series by Thistlebend Ministries.
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị