N'akuku osimiri nile nke Babilon, N'ebe ahu ka ayi nọduru ala, e, ayi kwara ákwá, Mb͕e ayi chetara Zaion. N'osisi willow di n'etiti ya Ka ayi nēkokwasi ubọ-akwara nile ayi. N'ihi na n'ebe ahu ka ndi nādọta ayi n'agha riọro n'aka-ayi okwu abù, Ndi lutara ihe-ayi n'agha riọ-kwa-ra ayi ka ayi ṅuria ọṅu, si, Bùaranu ayi otù nime abù Zaion. Àyi gēsi aṅa bù abù Jehova N'ala nke onye ala ọzọ? Ọ buru na echezọm i, Jerusalem, Ka aka-nrim chezọ ǹkà-ya. Ka irem rapara n'okpo-ọnum, Ma ọ buru na adighm-echeta gi; Ma ọ buru na adighm-eme ka Jerusalem di elu N'elu isi ọṅùm. Jehova, cheta ubọchi Jerusalem Megide umu Edom; Ndi nāsi, B͕abanu ya ọtọ, b͕abanu ya ọtọ, Rue ntọ-ala di nime ya. Gi ada Babilon, nke bu onye anāpunara ihe; Onye ihe nāgara nke-ọma ka ọ bu, bú onye gākwughachi gi Nmeso-gi nke i mesoworo ayi. Onye ihe nāgara nke-ọma ka ọ bu, bú onye gāchiri umu-gi nāṅu ara tupia ha Na nkume di elu.
Gụọ ABÙ ỌMA 137
Geere nke a ntị ABÙ ỌMA 137
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: ABÙ ỌMA 137:1-9
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ulo
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ
Vidiyo