Ọtutu mb͕e ka ha kpab͕uworom site na mb͕e m'di na nwata, Biko, ka Israel kwue otú a, si, Ọtutu mb͕e ka ha kpab͕uworom site na mb͕e m'di na nwata: Ma otú ọ di, ha apughi imegidem. N'elu azum ka ndi-plough jiri plough gwu dika esi egwu ala-ubi; Ha mere ka furrow nile ha di ogologo. Jehova bu onye ezi omume: O bipuwo udọ̀ nile nke ndi nēmebi iwu. Ka ihere me ha, ka ha laghachi kwa azu, Bú ndi nile nākpọ Zaion asì. Ka ha di ka ahihia nēpú n'elu ulo, Nke nākpọnwu mgbe o puputara: Nke onye nēwe ihe-ubi nējighi kpojue ọbu-aka-ya, Onye nēhie ùkwù-ọka nējighi kwa ya kpojue obi-ya. Ọzọ, ndi nāgabiga asighi, Ka ngọzi Jehova diri unu; Ayi agọziwo unu n'aha Jehova.
Gụọ ABÙ ỌMA 129
Geere nke a ntị ABÙ ỌMA 129
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: ABÙ ỌMA 129:1-8
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ulo
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ
Vidiyo