Megherenum ọnu-uzọ-ama nile nke ezi omume: M'gābà nime ha, m'gēkele Ja. Nka bu ọnu-uzọ-ama Jehova nwere; Ndi ezi omume gābà nime ya. M'gēkele Gi, n'ihi na I zawom, I we ghọrọm nzọputa. Nkume nke ndi nēwu ulo juru Aghọwo isi nkuku ulo. Ọ bu n'aka Jehova ka nka sitere; Nke ahu bu oké ọlu n'anya-ayi. Nka bu ubọchi Jehova meworo; Ayi gētegari egwú ọṅù, ṅuri kwa ọṅu nime ya. Biko, Jehova, zọputa, biko: Biko, Jehova, me ka ihe nāgara ayi nke-ọma, biko. Onye agọziri agọzi ka Onye ahu bu Nke nābia n'aha Jehova: Ayi esiwo n'ulo Jehova gọzie unu. Chineke ka Jehova bu, Ọ nyewo kwa ayi ìhè: Chiri udọ̀ ke àjà-ememe, durue ya na mpi nile nke ebe-ichu-àjà. Chinekem ka I bu, m'gēkele kwa Gi: Chinekem ka I bu, m'gēbuli Gi elu. Kelenu Jehova; n'ihi na Ọ di nma: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di.
Gụọ ABÙ ỌMA 118
Geere nke a ntị ABÙ ỌMA 118
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: ABÙ ỌMA 118:19-29
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ulo
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ
Vidiyo