Kelenu Jehova; n'ihi na Ọ di nma: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di. Biko, ka Israel si, Na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di. Biko, ka ulo Eron si, Na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di. Biko, ka ndi nātu egwu Jehova si, Na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di. M'siri na nkpàm kpọkue Ja; Ja zaram, me ka m'nọdu n'ebe sara mbara. Jehova dirim; m'gaghi-atu egwu: Gini ka madu gēmem? Jehova dirim n'etiti ndi nēyerem aka: Mu onwem gēlekwasi kwa ndi nākpọm asì. Ọ di nma ib͕abà nime Jehova Kari itukwasi madu obi. Ọ di nma ib͕abà nime Jehova Kari itukwasi ndi amara aha-ha obi.
Gụọ ABÙ ỌMA 118
Geere nke a ntị ABÙ ỌMA 118
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: ABÙ ỌMA 118:1-9
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị