Kelenu Jehova; n'ihi na Ọ di nma: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di. Biko, ka Israel si, Na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di. Biko, ka ulo Eron si, Na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di. Biko, ka ndi nātu egwu Jehova si, Na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di. M'siri na nkpàm kpọkue Ja; Ja zaram, me ka m'nọdu n'ebe sara mbara. Jehova dirim; m'gaghi-atu egwu: Gini ka madu gēmem? Jehova dirim n'etiti ndi nēyerem aka: Mu onwem gēlekwasi kwa ndi nākpọm asì. Ọ di nma ib͕abà nime Jehova Kari itukwasi madu obi. Ọ di nma ib͕abà nime Jehova Kari itukwasi ndi amara aha-ha obi. Mba nile ab͕awom buruburu: N'aha Jehova ka m'gēbipusi ha. Ha ab͕awom buruburu; e, ha ab͕awom buruburu: N'aha Jehova ka m'gēbipusi ha. Ha ab͕awom buruburu dika aṅu; emenyuwo ha dika ọku ogwu: N'aha Jehova ka m'gēbipusi ha. I nudawom enuda ka m'we da: Ma Jehova yerem aka. Ikem na abù ọmam ka Ja bu: Ọ ghọwo-kwa-ram nzọputa. Olu nke iti-nkpu-ọṅù na nzọputa di n'ulo-ikwū nile nke ndi ezi-omume: Aka-nri Jehova nēme ihe dìnkpà. Ebuliwo aka-nri Jehova elu: Aka-nri Jehova nēme ihe dìnkpà. M'gaghi-anwu, kama m'gādi ndu, M'gākọ kwa akukọ ọlu nile nke Ja. Ja adọwom aka na nti nke-uku: Ma ọ bughi n'aka ọnwu ka O nyeworom.
Gụọ ABÙ ỌMA 118
Geere nke a ntị ABÙ ỌMA 118
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: ABÙ ỌMA 118:1-18
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ulo
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ
Vidiyo