Tonu Ja. M'gēwere obim nile kele Jehova, N'ìzu nzuzo nke ndi ziri ezi, na nime nzukọ Israel. Ọlu nile nke Jehova di uku, Buru ihe ndi nile ha nātọ utọ nāchọputa. Ebube na ima-nma ka ọlu-Ya bu: Ezi omume-Ya nēguzo kwa rue mb͕e ebighi-ebi. Ihe-ncheta ka O meworo nye oké ọlu-Ya nile: Onye nēme ebere na Onye nwere obi-ebere ka Jehova bu. Anu-ndọb͕u ka O nyeworo ndi nātu egwu Ya: Ọ gēcheta ọb͕ub͕a-ndu-Ya rue mb͕e ebighi-ebi. O gosiwo ndi-Ya ike nke ọlu-Ya nile, N'inye ha ihe-nketa mba nile. Ọlu nile nke aka-Ya bu ezi-okwu na ikpé ziri ezi; Ihe kwesiri ntukwasi-obi ka ukpuru-Ya nile bu. Ihe anākwagide rue mb͕e nile ebighi-ebi ka ha bu, Ha bu ihe anēme n'ezi-okwu na izi-ezi. Nb͕aputa ka O ziteworo ndi-Ya; O nyewo ọb͕ub͕a-ndu-Ya iwu rue mb͕e ebighi-ebi: Ihe di nsọ na ihe anātu egwu ka aha-Ya bu. Nmalite amam-ihe ka egwu Jehova bu; Ezi uche ka ndi nile nēme ha nwere: Otuto-Ya nēguzo rue mb͕e ebighi-ebi.
Gụọ ABÙ ỌMA 111
Geere nke a ntị ABÙ ỌMA 111
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: ABÙ ỌMA 111:1-10
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị