Edoziwo obim, Chineke; M'gābù abù, e, m'gābù abù ọma, ọbuná nsọpurum ka m'gēji bù abù. Teta, une na ubọ-akwara: M'gākpọte chi-ọbubọ. M'gēkele Gi n'etiti ndi nile di iche iche, Jehova: M'gābùku kwa Gi abù ọma netiti mba nile. N'ihi na ebere-Gi di uku kari elu nke elu-igwe, Ezi-okwu-Gi di kwa uku rue mbara-ígwé. Me Onwe-gi ka I di elu n'elu elu-igwe nile, Chineke: Ka ebube-Gi di kwa n'elu uwa nile. Ka ewe dọputa ndi I huru n'anya, Were aka-nri-Gi zọputa, za kwa ayi. Chineke ekwuwo okwu n'idi-nsọ-Ya: ka m'ṅuria ọṅu-agha: M'gēkè Shekem, tù kwa ndagwurugwu Sukot. Mu nwe Gilead; mu nwe Manase; Efraim bu kwa ebe siri ike nke isim; Juda bu nkpa-n'aka-ezem. Moab bu ite ọsisa-arum; N'elu Edom ka m'gātu akpukpọ-ukwum: N'aru Filsitia ka m'gēti nkpu. Ònye gēdubàm nke-ọma n'obodo ewusiri ike? Ònye duruworom rue Edom? Ọ̀ bughi Gi, Chineke, juworo ayi aju? I dighi-apu kwa ije agha n'etiti usu nile nke ndi-agha-ayi, Chineke. Yere ayi aka ka ayi pua n'aka onye-nkpab͕u: N'ihi na ihe-efu ka nzọputa madu bu. Nime Chineke ayi gēme ihe dìnkpà: Ọ bu kwa Ya onwe-ya gāzọda ndi nākpabu ayi.
Gụọ ABÙ ỌMA 108
Geere nke a ntị ABÙ ỌMA 108
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: ABÙ ỌMA 108:1-13
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ulo
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ
Vidiyo