Ọzọ, ha juru ala anāchọsi ike, Ha ekweghi okwu-Ya; Ha we tamu n'ulo-ikwū nile ha, Ha egeghi nti n'olu Jehova. O we welie aka-Ya elu n'ebe ha nọ, Ime ka ha da n'ọzara: Na ime ka nkpuru-ha da n'etiti mba nile, Na ichusa ha n'ala nile. Ha kekọta-kwa-ra onwe-ha n'aru Beal-peoa, We rie àjà nile nke ihe nwuru anwu. Ha we were omume nile ha kpasue Ya iwe: Ihe-otiti we dakwasi ha. Finehas wee guzo ọtọ, me ihe ekpere n'ikpe: Ewe b͕ochi ihe-otiti ahu. Ewe guara ya nka n'ezi omume, Rue ọb͕ọ nile rua mb͕e ebighi-ebi. Ha kpasu-kwa-ra Ya iwe na miri Meriba, O we jọrọ Moses njọ n'ihi ha: N'ihi na ha nupuru isi n'okpuru Mọ-Ya, O we were eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua kwue okwu efu. Ha ekpochapughi ndi di iche iche ahu, Dika Jehova siri ha; Ma ha gwakọtara onwe-ha na mba nile nke ala ahu, We muta ọlu nile ha
Gụọ ABÙ ỌMA 106
Geere nke a ntị ABÙ ỌMA 106
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: ABÙ ỌMA 106:24-35
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ulo
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ
Vidiyo