Tonu Ja. Kelenu Jehova; n'ihi na Ọ di nma: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di. Ònye gākọ akukọ idi-ike nile nke Jehova? Ònye gēme ka anuru otuto-Ya nile? Ndi ihe nāgara nke-ọma ka ndi nēdebe ikpé bu, Ha na onye nēme ezi omume na mb͕e nile. Chetam, Jehova, were ka ihe ndi-gi si atọ Gi utọ chetam; Were nzọputa-Gi letam: Ka m'we lekwasi ọdi-nma nke ndi I rọputaworo, Ka m'we ṅuria n'ọṅù mba-Gi, Ka m'we soro ihe-nketa-Gi nya isi. Ayi esowo nna-ayi-hà mehie, Ayi emewo ajọ omume, ayi emebiwo iwu. Nna-ayi-hà enweghi uche ighọta oké ọlu-Gi nile n'Ijipt; Ha echetaghi iba-uba nke ebere-Gi nile; Ha we nupu isi n'akuku oké osimiri, bú n'Oké Osimiri Uhie. Ma Ọ zọputara ha n'ihi aha-Ya, Ime ka amara idi-ike-Ya. O we basiere Oké Osimiri Uhue nba, o we tasia: O we me ka ha nēje ije n'ob͕u-miri-ya nile dika ọ bu ọzara. O we zọputa ha n'aka onye nākpọ ha asì, B͕aputa kwa ha n'aka onye-iro-ha. Miri we kpuchie ndi nākpab͕u ha: Ọ dighi otù onye nime ha fọduru. Ha we kwere okwu-Ya nile; Ha nābù abù otuto-Ya.
Gụọ ABÙ ỌMA 106
Geere nke a ntị ABÙ ỌMA 106
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: ABÙ ỌMA 106:1-12
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ulo
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ
Vidiyo