N'ihi na na window nke ulom N'oghere-inara-ifufem ka m'lepuru anya; M'we hu n'etiti ndi nēnweghi uche, M'mata n'etiti umu-ndikom, Otù nwa-okorọbia nke obi amam-ihe kọrọ, Ka ọ nāgabiga n'amá na nso nkuku nwanyi ahu, Ọ bu kwa n'uzọ ulo-ya ka ọ nāzọ ije; Na chi-ojiji, n'anyasi nke ubọchi, Nime nb͕achi nke abali na ọchichiri. Ma, le, otù nwanyi zutere ya Yiri uwe nke nwanyi nākwa iko, ọ bu kwa onye echeworo obi-ya. Onye nēme nkpọtu ka ọ bu, buru kwa onye nēwezuga onwe-ya; Ọ bughi n'ulo-ya ka ukwu-ya nānọ: Ub͕u a n'èzí ka ọ nọ, ub͕u a ọ bu n'amá nile, Ọ bu kwa na nso nkuku nile ọ bula ka ọ nēche anwu. Nwanyi ahu we jide ya aka, sutu kwa ya ọnu, Were iru ihere nādighi si ya: Ihe àjà nile nke àjà-udo di n'akam; Ta ka m'kwughachiworo ihe nile m'kwere na nkwa. N'ihi nka ka m'putara izute gi, Ichọsi iru-gi ike, m'we chọputa gi. Ákwà-nb͕abá mara nma ka m'b͕abáworo n'ihe m'ji edina, Bú ákwà turu agwa nke ogho Ijipt. Ewerewom myrrh na aloes na cinnamon Fesa ihe-ndinam. Bia, ka afọ jubiga ayi ókè n'ikwa-iko rue ututu; Ka ayi me ka obi tọ ayi utọ n'ihu-n'anya nile. N'ihi na dim anọghi n'ulo, O jewo ije di anya: Ọ werewo akpa ego n'aka-ya; N'ubọchi ọnwa-ndọzu ka ọ gālata. O were ọtutu urà-ya wezuga nwa-okorọbia ahu ka ọ ba n'ulo-ya, O were okwu ire-utọ nke eb͕ub͕ere-ọnu-ya nufue ya. Nwa-okorọbia ahu nējeso ya na mberede, Dika ehi si abia n'ob͕ub͕u-ya, Ma-ọbu dika nkpọrọ-ukwu si abia n'idọ-aka-na-nti nke onye b͕agọrọ ab͕agọ n'uche-ya; Rue mb͕e àkú gēji b͕apue imeju-ya; Dika nnunu si eme ngwa ibà n'ib͕udu, Ma ọ maghi na imegide ndu-ya ka ọ bu.
Gụọ ILU 7
Geere nke a ntị ILU 7
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: ILU 7:6-23
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ulo
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ
Vidiyo