Okwu Agua nwa Jake; ibu eboro ya. Ihe nke si n'ọnu nwoke ahu putara Itiel, ọbuná Itiel na Ukal. N'ezie anu-ọhia ka m'bu kari onye ọ bula, Ọ dighi kwa nghọta madu m'nwere Amutaghkwam amam-ihe, Ọ dighi kwa ihe-ọmuma Onye Nsọ m'mara. Ònye rigoworo n'elu-igwe, we rida? Ònye chikọtaworo ifufe nime nkwukwuba-aka-Ya abua? Ònye kegideworo miri n'uwe-Ya? Ònye meworo ka nsọtu nile nke uwa guzosie ike? Gini bu aha-Ya, gini bu kwa aha nwa-Ya, ma asi na i mara? Okwu-ọnu ọ bula nke Chineke bu ihe anuchaworo: Ọta ka Ọ buru ndi nāb͕abà nime Ya. Atukwasila ihe n'okwu-Ya nile, Ka O we ghara ibara gi nba, i we ghọ onye-okwu-ugha. Ihe abua ka m'riọworo Gi; Ajulam ha tutu mu anwua: Me ka ihe-efu na okwu-ugha di anya n'ebe m'nọ: Enyelam ọnọdu-ob͕eye ma-ọbu àkù; Me ka m'rie nri rurum: Ka afọ we ghara ijum, m'we gọ agọ, si, Ònye bu Jehova? Ma-ọbu ka ewe ghara inapum ihe nile, m'we zu ori, We were aha Chinekem me ihe ọjọ.
Gụọ ILU 30
Geere nke a ntị ILU 30
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: ILU 30:1-9
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ulo
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ
Vidiyo