Okwu Agua nwa Jake; ibu eboro ya.
Ihe nke si n'ọnu nwoke ahu putara Itiel, ọbuná Itiel na Ukal.
N'ezie anu-ọhia ka m'bu kari onye ọ bula,
Ọ dighi kwa nghọta madu m'nwere
Amutaghkwam amam-ihe,
Ọ dighi kwa ihe-ọmuma Onye Nsọ m'mara.
Ònye rigoworo n'elu-igwe, we rida?
Ònye chikọtaworo ifufe nime nkwukwuba-aka-Ya abua?
Ònye kegideworo miri n'uwe-Ya?
Ònye meworo ka nsọtu nile nke uwa guzosie ike?
Gini bu aha-Ya, gini bu kwa aha nwa-Ya, ma asi na i mara?
Okwu-ọnu ọ bula nke Chineke bu ihe anuchaworo:
Ọta ka Ọ buru ndi nāb͕abà nime Ya.
Atukwasila ihe n'okwu-Ya nile,
Ka O we ghara ibara gi nba, i we ghọ onye-okwu-ugha.
Ihe abua ka m'riọworo Gi;
Ajulam ha tutu mu anwua:
Me ka ihe-efu na okwu-ugha di anya n'ebe m'nọ:
Enyelam ọnọdu-ob͕eye ma-ọbu àkù;
Me ka m'rie nri rurum:
Ka afọ we ghara ijum, m'we gọ agọ, si, Ònye bu Jehova?
Ma-ọbu ka ewe ghara inapum ihe nile, m'we zu ori,
We were aha Chinekem me ihe ọjọ.
Ekpèla orù ikpè n'iru onye-nwe-ya,
Ka o we ghara ikọcha gi, ikpé ewe ma gi.
Ọb͕ọ di nke nākọcha nna-ha,
Ha adighi-agọzi kwa nne-ha.
Ọb͕ọ di nke di ọcha n'anya-ha,
Ma orurú-inyi-ha nke nēsì ísì ka anāsachapughi.
Ọb͕ọ di, le ka anya-ha si di elu nke-uku!
Anēbuli kwa mbubere-anya-ha.
Ọb͕ọ di, mma-agha ka ezé nile ha bu, ọ bu kwa mma ka ikiri-ezé-ha bu,
Irichapu ndi ewedara n'ala n'uwa, na irichapu ndi-ob͕eye n'etiti madu.
Etu nwere umu abua, nāsi, Nye, nye.
Ihe atọ di nke afọ nādighi-eju,
E, anọ di nke nāsighi, O b͕owo:
Ala-mọ; na afọ nwayi-àgà;
Na ala afọ miri nējughi;
Na ọku nke nāsighi, O b͕owo.
Anya nke nākwa nna-ya emò,
Nke nēleda kwa iṅa nne-ya nti,
Ugolo-ọma nke ndagwurugwu gāghuputa ya,
Umu-ugo gēri kwa ya.