Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ILU 28:15-28

ILU 28:15-28 IGBOB

Ọdum nke nāb͕o uja na anu-ọhia bear nke nāb͕aghari Ka onye nēmebi iwu nke nāchi ndi nēnweghi ike bu. Gi onye-ndú nke nghọta kọrọ, nke bu kwa onye-nmeb͕u uku, Onye nākpọ urù nēzighi ezi asì gēme ka ubọchi-ya nile di ogologo. Madu nke ọbara madu nānyib͕u, Rue olùlù ka ọ gāb͕alaga; ka onye ọ bula ghara ijide ya. Onye nēje ije n'izu-okè ka agāzọputa: Ma onye b͕agọrọ ab͕agọ n'uzọ abua gāda ngwa ngwa. Onye nālu ala-ubi-ya, afọ gēju ya na nri: Ma onye nāb͕aso ihe-efu di iche iche, afọ gēju ya n'ibu-ob͕eye. Onye ọ bula nke kwesiri ntukwasi-obi gēnwe ọtutu ngọzi: Ma onye nānukpọ onwe-ya ibu ọgaranya, agaghi-agu ya n'onye nēmeghi ihe ọjọ. Imata iru madu n'ikpé adighi nma: Ọ dighi kwa nma ka madu ji n'ihi iberibe nri nējehie. Onye nāb͕aso àkù ka onye nwere anya ọjọ bu, Ma ọ maghi na ihe-ukọ gābiakute ya. Onye nābara madu nba gēmesia huta amara Kari onye nēkwu ire-utọ. Onye nānapu nna-ya ma-ọbu nne-ya ihe n'ike, si, Ọ dighi njehie ọ bu; Onye ejikọtaworo ya na onye-nbibi ka ọ bu. Onye nkpuru-obi-ya di nganga nākpali ise-okwu: Ma onye nātukwasi Jehova obi, agēme, ya ka ọ ma abuba. Onye nātukwasi obi n'obi nke aka ya, onye ahu bu onye-nzuzu: Ma onye nēje ije n'amam-ihe, onye ahu ka agēme ka o wepuga onwe-ya. Onye nēnye ob͕eye ihe, ihe adighi-akọ ya: Ma onye nēzobe anya-ya abua, agābu ya ọtutu ọnu. Mb͕e ndi nēmebi iwu nēbili, madu ezobe onwe-ya: Ma mb͕e ha nāla n'iyì, ndi ezi omume aba uba.