Chiri uwe-ya, bú onye nọworo onye ala ọzọ na mbe; N'ọnọdu ndi mba ọzọ nara ya onwe-ya n'ihe-ibe. Ọ nātọ madu utọ, bú nri okwu-ugha; Ma emesia nkpuru-ájá gēju ya ọnu. Èchìchè nile nēji ndum-ọdu guzosi ike: Gi were kwa ezi ndum-ọdu bue agha. O nēkpughe ìzù nzuzo, bú onye nējeghari dika onye nāb͕a àmà ọjọ. Agwakọta-kwa-la onwe-gi n'onye ji eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua arafu madu. Onye nākọcha nna-ya ma-ọbu nne-ya, Oriọna-ya gānyu na nb͕achi nke ọchichiri. Ihe-nketa nke anānara ọsọsọ na mbu; Agaghi-agọzi kwa ikpe-azu-ya. Asila, M'gākwughachi ugwọ ihe ọjọ: Le anya Jehova, Ọ gāzọputa kwa gi. Ihe-árú n'anya Jehova ka uzọ nkume-isì-ihe abua bu; Ihe-osìsì aghughọ adighi kwa nma. N'aka Jehova ka nzọ-ukwu nile nke madu nēsite; Màdu gēsi kwa aṅa ghọta uzọ-ya? Ọnyà mara madu ma ọ buru na o were ọsọsọ si, Ọ di nsọ, Ma mb͕e ọ kwesiri nkwa o we ju ajuju. Ọ nāfuchapu ndi nēmebi iwu, bú eze mara ihe, Ọ nēme kwa ka wheel nsucha-ọka laghachi n'elu ha. Oriọna Jehova ka ume ndu madu bu, Nēgwuputa ime-ime-ala afọ nile. Ebere na ezi-okwu nēchebe eze: O ji kwa ebere akwagide oche-eze-ya. Ima-nma umu-okorọbia ka ike-ha bu: Ihe-nsọpuru ndi-okenye ka isi-awọ bu kwa. Ufiri-utali nke nēmeru aru nēchichapu ihe ọjọ: Iti-ihe nēru kwa ime-ime-ala afọ.
Gụọ ILU 20
Geere nke a ntị ILU 20
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: ILU 20:16-30
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị