Onye nākwa emò ka manya-vine bu, onye-nkpọtu ka ihe-ọṅuṅu nke nābà n'anya bu; Onye ọ bula nke nāwaghari site na ya amaghi ihe. Ọb͕ub͕ọ-uja dika nke ọdum ka oké ujọ anātu eze bu: Onye nākpasu Ya iwe nke nērubiga ókè nēmehie megide ndu nke aka ya. Ọ buru madu nsọpuru ikwusi ilu ọ̀gù: Ma onye ọ bula nke uche-ya b͕agọrọ ab͕agọ ganālusi ọ̀gù ike. N'ihi na ọ bu mb͕e oyi nātu, onye-ume-ngwu agaghi-alu ọlu ubi; Ọ gāriọ aririọ na mb͕e owuwe-ihe-ubi, ọ dighi kwa ihe ọ gēnwe. Miri nke miri emi ka ndum-ọdu n'obi madu bu; Ma onye-nghọta gādọputa ya. Ọtutu madu nākpọsa, onye ọ bula ebere nke aka ya: Ma onye kwesiri ntukwasi-obi, ònye gāchọputa ya? Onye ezi omume nke nējeghari n'izu-okè-ya, Ndi ihe nāgara nke-ọma ka umu-ya nke gānọchi ya gābu. Eze nke nānọkwasi n'oche ikpé Ji anya-ya abua afuchapu ihe ọjọ nile. Ònye gāsi, Emewom ka obim di ọcha, Aghọwom onye di ọcha pua na nmehiem? Uzọ nkume-isì-ihe abua, na uzọ ephah abua, Ihe-árú n'anya Jehova ka ha abua bu n'otù. Ọbuná nwata nēme ka amata ya site n'omume-ya nile, Ma ọlu-ya di ọcha, ma o zi-kwa-ra ezi. Nti nke nānu ihe, na anya nke nāhu uzọ, Jehova emewo ọbuná ha abua. Ahula urá n'anya, ka ewe ghara inapu gi ihe nile; Meghe anya-gi abua, rijue nri afọ. Ọ jọrọ njọ, ọ jọrọ njọ, ka onye nāzù azù nāsi: Ma mb͕e ọ laworo n'ulo-ya, mb͕e ahu ka ọ nānya isi. Ọla-edo di, na ọtutu ruby: Ma ihe di oké ọnu-ahia ka eb͕ub͕ere-ọnu nke nēkwu ihe-ọmuma bu.
Gụọ ILU 20
Geere nke a ntị ILU 20
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: ILU 20:1-15
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ulo
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ
Vidiyo