Onye nāzaghachi okwu tutu ọ nu, Uche b͕agaọrọ ab͕agọ na ọnọdu-ihere ka ọ buru ya. Mọ madu gānagide ọria-ya; Ma mọ madu nke etib͕uru etib͕u, ònye gēburu ya? Obi onye-nghọta nēnweta ihe-ọmuma; Ọzọ, nti ndi mara ihe nāchọ ihe-ọmuma. Onyinye madu nākwara ya uzọ sara mbara, Ọ bu kwa n'iru ndi uku ka o nēdu ya je. Onye ezi omume n'anya ndi-ikpe ka onye ahu bu nke buru uzọ kpe ọnu-ya; Ma madu-ibe-ya abia gwuputa ala okwu-ya. Ife-nzà nēme ka ise-okwu kwusi, Ọ bu kwa ndi nwere ume ka ọ nēkewa. Nwa-nne ejehieworo megide di ike iwere kari obodo siri ike: Ise-okwu di kwa ka ihe-ntuchi nile nke-elu. Site na nkpuru nke ọnu onwe-ya ka afọ gēju afọ onye ọ bula; N'ihe-omume nke eb͕ub͕ere-ọnu-ya ka afọ gēju ya. Ọnwu na ndu di ire n'aka; Ọzọ, ndi nāhu ya n'anya gēri nkpuru-ya. Onye chọtaworo nwunye achọtawo ezi ihe, Ọ gēnweputa kwa n'aka Jehova na ihe-ya gātọ Ya utọ. Okwu aririọ-amara di iche iche ka ob͕eye nēkwu: Ma ọgaranya nāza ike ike. Onye nēnwe ọtutu eyì nēnwe ha ibibi onwe-ya: Ma onye nāhu n'anya di nārapara n'aru kari nwa-nne.
Gụọ ILU 18
Geere nke a ntị ILU 18
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: ILU 18:13-24
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ulo
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ
Vidiyo