Nání na nganga ka ilu-ọ̀gù nāputa: Ma n'aka ndi aduworo ọdu ka amam-ihe di. Àkù nke sitere n'ihe-efu gēbilata: Ma onye ji aka-ya achikọta ihe gāba uba. Nchere anēchere ogologo mb͕e di anya nēme ka obi nāria ọria: Ma osisi nke nēnye ndu ka ihe anāchọsi ike bu, mb͕e ọ biaruworo. Onye nēleda okwu Chineke anya nēmebi onwe-ya: Ma onye nātu egwu ihe enyere n'iwu, onye ahu ka agākwughachi ugwọ. Iwu onye mara ihe bu isi-iyi nke ndu, Isi n'ọnyà nile nke ọnwu wezuga onwe-gi. Ezi uche nēnye amara: Ma uzọ ndi-nghọb͕u bu nání nkume. Onye ọ bula nke nwere ezi uche ji ihe-ọmuma alu ọlu: Ma onye-nzuzu nāb͕asa uche b͕agọrọ ab͕agọ. Onye-ozi nke nēmebi iwu nādabà n'ihe ọjọ: Ma ukọ̀ nke kwesiri ntukwasi-obi bu ihe nāgwọ madu. Inọ-n'ob͕eye na nlelì gādiri onye nēzere idọ-aka-na-nti: Ma onye nāriba iba-nba ama ka agāsọpuru. Mb͕e ihe anāchọsi ike mere ọ nātọ nkpuru-obi utọ: Ma ọ bu ihe-árú n'anya ndi-nzuzu isi n'ihe ọjọ wezuga onwe-ha.
Gụọ ILU 13
Geere nke a ntị ILU 13
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: ILU 13:10-19
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ulo
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ
Vidiyo