Nwa nke mara ihe nānu idọ-aka-na-nti nna-ya: Ma onye nākwa emò anughi ibasi-nba-ike. Site na nkpuru nke ọnu-ya ka onye ọ bula gēri ezi ihe: Ma nkpuru-obi ndi nāghọb͕u aghọb͕u gēri ime-ihe-ike. Onye nēche ọnu-ya nche nēdebe ndu-ya: Ma onye nāsaghepu eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua, nbibi gādiri ya. Ọ nāchọsi ike, ma ọ dighi ihe o nwere, bú nkpuru-obi onye-ume-ngwu: Ma nkpuru-obi nke ndi di nkọ, agēme ya ka ọ ma abuba. Okwu-ugha ka onye ezi omume nākpọ asì: Ma onye nēmebi iwu nēsì ísì, we nwe iru-ihere. Ezi omume nēchebe onye zuru okè n'uzọ: Ma nmebi-iwu nēme ka onye-nmehie kpùe iru. O nwere onye nēme onwe-ya ọgaranya, ma ọ dighi ihe ọ bula o nwere: O nwere onye nēme onwe-ya ob͕eye, ma àkù-ya bara uba. Ihe-nb͕aputa nke ndu onye ọ bula bu àkù-ya: Ma ob͕eye anughi ibasi-nba-ike. Ìhè ndi ezi omume nāṅuri ọṅu: Ma oriọna ndi nēmebi iwu gānyu.
Gụọ ILU 13
Geere nke a ntị ILU 13
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: ILU 13:1-9
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ulo
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ
Vidiyo