Eb͕ub͕ere-ọnu abua nke onye ezi omume nāzù ọtutu madu: Ma ndi b͕agọrọ ab͕agọ n'uche-ha nānwu n'ihi na obi amam-ihe kọrọ ha. Ngọzi Jehova, nke ahu nēme madu ọgaranya, Ọ dighi-atukwasi kwa ya ihe-nwuta. Ọ diri onye-nzuzu dika igwuri-egwú, bú ime ihe-nzube ọjọ: Otú a ka amam-ihe di-kwa-ra onye-nghọta. Ihe onye nēmebi iwu nātu ujọ ya, nke ahu gābiakute ya: Ma ihe ndi ezi omume nāchọsi ike ka agēnye ha. Mb͕e oké ifufe nēfebiga, onye nēmebi iwu anọghi kwa: Ma onye ezi omume bu ntọ-ala ebighi-ebi. Dika manya b͕ara uka si adi n'ebe ezé di, na dika anwuru-ọku si adi n'ebe anya di, Otú a ka onye-ume-ngwu nādi n'ebe ndi nēzì ya ozi nọ. Egwu Jehova nātukwasi ubọchi na ndu madu: Ma arọ nile nke ndi nēmebi iwu gādi nkpunkpu. Nchere ndi ezi omume gābu ọṅù: Ma olile-anya ndi nēmebi iwu gāla n'iyì. Ebe siri ike n'ebe onye zuru okè nọ ka uzọ Jehova bu; Ma ọ bu nbibi n'ebe ndi nālu ajọ ihe nọ. Agaghi-ewezuga onye ezi omume n'ọnọdu-ya rue mb͕e ebighi-ebi: Ma ndi nēmebi iwu agaghi-ebi n'uwa.
Gụọ ILU 10
Geere nke a ntị ILU 10
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: ILU 10:21-30
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ulo
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ
Vidiyo