Amam-ihe nēti nkpu n'èzí; N'amá nile ka ọ nēme ka olu-ya da udà; N'isi ebe nile anātu ùzù ka ọ nākpọ òkù; N'oghere ọnu-uzọ-ama nile, N'obodo, ka o nēkwu okwu-ọnu-ya nile: Unu ndi nēnweghi uche, rùe ole mb͕e ka unu gāhu enweghi-uche n'anya? Rùe ole mb͕e ka ndi nākwa emò gāchọsi-kwa-ra onwe-ha ikwa-emò ike? Rùe ole mb͕e ka ndi-nzuzu gākpọ kwa ihe-ọmuma asì? Laghachinu n'iba-nbam: Le, m'gāwupuru unu mọm, M'gēme ka unu mara okwum nile. N'ihi na akpọwom òkù, unu we ju; Esetipuwom akam, ma ọ dighi onye nāṅa nti; Unu we wezuga ndum-ọdum nile, Unu achọghi kwa iba-nbam: Mu onwem kwa, na nhuju-anya-unu m'gāchì ọchì; M'gākwa emò mb͕e oké egwu-unu nābia; Mb͕e oké egwu-unu nābia dika ikuku siri ike, Mb͕e nhuju-anya-unu nābiaru kwa dika oké ifufe; Mb͕e ahuhu na nkpà nābiakwasi unu. Mb͕e ahu ka ha gākpọkum, ma m'gaghi-aza; Ha gāchọsim ike, ma ha agaghi-achọtam: N'ihi na ha kpọrọ ihe-ọmuma asì, Na n'ihi na ọ bughi egwu Jehova ka ha rọputara: Ha achọghi ndum-ọdum; Ha lelìri iba-nbam nile: Ha gēri kwa ufọdu nime nkpuru nke uzọ-ha, Ọ bu kwa ndum-ọdu nile nke aka ha gēju ha afọ. N'ihi na nchighari-azu nke ndi nēnweghi uche gēb͕u ha, Ọ bu kwa inọ-n'udo nke ndi-nzuzu gēme ka ha la n'iyì. Ma onye nēgem nti gēbi na ntukwasi-obi, Ọ gānọ kwa jū nātughi oké egwu ihe ọjọ.
Gụọ ILU 1
Geere nke a ntị ILU 1
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: ILU 1:20-33
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị