n'ihi na ayi onwe-ayi bu ndi obibì-úgwù, ndi ji Mọ nke Chineke nēkpe ekpere, ndi nānya kwa isi nime Kraist Jisus, ndi natukwasighi kwa obi n'anu-aru-ayi: ọ bu ezie na mu onwem puru itukwasi obi ọbuná n'anu aru: ọ buru na onye ọ bula ọzọ nēchè na ya puru itukwasi obi n'anu-aru, mu onwem puru itukwasi obi n'anu-aru kari: ebìrim úgwù n'ubọchi nke-asatọ, esiterem n'umu Israel, site kwa n'ebo Benjamin, abum onye-Hibru nke sitere na ndi-Hibru; n'akuku iwu, abumri onye-Farisi; n'akuku inu-ọku-n'obi, anamesob͕uri nzukọ Kraist; n'akuku ezi omume nke di nime iwu, ahuru na adighi m ita uta. Otú ọ di, ihe ọ bula nke baram urù, ihe ndia ka m'guru n'ihe-iyì n'ihi Kraist-ayi. E, tukwasi kwa, anamagu kwa ihe nile n'ihe-iyì n'ihi ọkika nke ọmuma Kraist Jisus, bú Onye-nwem: Onye m'yiri iyì ihe nile nkem n'ihi Ya, anamagu kwa ha n'ihe-nkpofu, ka m'we rita Kraist n'urù, ewe hum nime Ya, nēnweghi ezi omume ọ bula nke akam, bú nke sitere n'iwu, kama nēnwe ezi omume ahu nke okwukwe ekwere na Kraist nēweta, bú ezi omume ahu nke sitere na Chineke n'elu okwukwe
Gụọ NDI FILIPAI 3
Geere nke a ntị NDI FILIPAI 3
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: NDI FILIPAI 3:3-9
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị