Umu-nnam, dinu n'otù n'iṅomim, nēle-kwa-nu ndi nējeghari otú a, otú unu nwere ayi dika ihe-atù N'ihi na ọtutu nējeghari, ndi m'nāgwari unu okwu bayere ha ọtutu oge, ma ub͕u a ọ bu kwa n'ákwá ka m'nāgwa unu, na ha bu ndi-iro obe nke Kraist: ndi ọgwugwu-ha bu ila-n'iyì, ndi chi-ha bu afọ-ha, ndi otuto-ha di kwa n'ihere-ha, ndi nātukwasi uche n'ihe uwa. N'ihi na ala-ayi di n'elu-igwe ub͕u a; site n'ebe ayi nēchesi kwa Onye-nzọputa ike, bú Onye-nwe-ayi Jisus Kraist: Onye gēme aru nke ọnọdu-ayi di ala ka o nwe oyiyi ọhu, ka ya na aru nke ebube-Ya we nwekọ otù udi, dika ilusi-ọlu-ike ahu si di nke O ji pu ọbuná ido ihe nile n'okpuru Onwe-ya.
Gụọ NDI FILIPAI 3
Geere nke a ntị NDI FILIPAI 3
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: NDI FILIPAI 3:17-21
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị