Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

NDI FILIPAI 2:12-30

NDI FILIPAI 2:12-30 IGBOB

Ya mere, ndi m'huru n'anya, dika unu ṅara nti mb͕e nile, ọ bughi nání mb͕e m'nọ n'etiti unu, kama ub͕u a mb͕e m'nānọghi, werenu egwu na ima-jijiji luputa kari nzọputa nke onwe-unu nke-uku; n'ihi na ọ bu Chineke Onye nālusi ọlu ike nime unu ichọ-achọ-unu na ilusi-ọlu-ike-unu, n'ihi na ọ di Ya ezi nma. Menu ihe nile nējighi ntamu na iru-uka ọ bula; ka unu we ghọ ndi nādighi ita uta ndi nāghọghi kwa aghughọ, umu Chineke ndi anāpughi ita uta n'etiti ọb͕ọ b͕agọrọ ab͕agọ nke nēnwe kwa anya-uhie, ndi anāhu unu n'etiti ha dika ndi nēnye ìhè n'uwa, nēche okwu nke ndu n'iru madu; ka m'we nwe ihe inya isi nye n'ubọchi nke Kraist, na ab͕aghi m ọsọ n'efu, na adọb͕ughkwam onwem n'ọlu n'efu E, ọ buru kwa na anāwusim dika àjà-ihe-ọṅuṅu n'elu àjà na ifè-òfùfè nke okwukwe-unu, anamaṅuri ọṅu, so kwa unu nile nāṅuri ọṅu: n'otù uzọ ahu unu onwe-unu, ṅuri-kwa-nu ọṅu, sokwam nāṅuri ọṅu. Ma anamele anya nime Onye-nwe-ayi Jisus na m'gēzigara unu Timọti ọsọsọ, ka mu onwem we nwe kwa obi-utọ, mb͕e m'mara ọnọdu-unu. N'ihi na enweghi m onye ọ bula nke nkpuru-obi-ya yiri nke ya, bú onye gēcheb͕u onwe-ya bayere ọnọdu-unu n'ezie. N'ihi na ha nile nāchọ ihe nke aka ha, ọ bughi ihe nke Jisus Kraist, Ma unu mara ọnwunwa-ya, na, dika nwa nēso nna-ya, otú a ka o sorom buru orù n'izisa ozi ọma. Ya mere, onye a ka m'nēle anya na m'gēziga ya n'otù oge ahu, mb͕e ọ bula m'gāhu otú ọ gādirim: ma anamatukwasi obim nime Onye-nwe-ayi na mu onwem gābia kwa ọsọsọ. Ma anamagu ya ihe di nkpà izigara unu Epafrọdaitọs, bú nwa nna m na onye mu na ya nālukọ ọlu, onye mu na ya nēbukọ kwa agha, onye buru kwa onye-ozi-unu na onye nēfè òfùfè ib͕o nkpàm; ebe agu unu nile nāgusi ya ike, obi lọ-kwa-ra ya miri, n'ihi na unu nuru na aru-ya adighi ike: n'ihi na aru-ya adighi ike n'ezie, ọ nọ kwa nso ọnwu: ma Chineke mere ya ebere; ma ọ bughi nání ya onwe-ya, kama mu onwem kwa, ka m'we ghara inwe ihe-nwuta n'elu ihe-nwuta. Ya mere ọ nānukarim ọku n'obi iziga ya, ka ọ gābu, mb͕e unu huru ya ọzọ, ka unu we ṅuria ọṅu, ka mu onwem we nwe kwa ihe-nwuta nke dikariri ntà. Ya mere werenu ọṅù nile nara ya nke-ọma nime Onye-nwe-ayi; nāsọpuru-kwa-nu ndi di otú a: n'ihi na ọ bu n'ihi ọlu Kraist ka ọ biaruru ọnwu nso, nēkwere itufu ndu-ya, ka o we mezu ihe fọduru unu ime n'ifè-òfùfè-unu n'ebe m'nọ.