Anamekele Chinekem na ncheta nile m'nēcheta unu, mb͕e nile n'aririọ nile m'nāriọrọ unu nile nāriọ aririọ ahu nime ọṅù, n'ihi nnwekọ unu nwekọrọ n'izisa ozi ọma site n'ubọchi mbu rue ub͕u a; ebe m'tukwasiworo obim n'otù ihe nka, na Onye malitere ilu ezi ọlu nime unu gāluzu ya rue ubọchi Jisus Kraist: dika o ziri ezi ka m'tukwasi uchem n'ihe a bayere unu nile, n'ihi na enwerem unu n'obim, ebe unu nile bu ndi nēsom n'inwekọ amara, ma nime ab͕um ma nime ngọpu nke ozi ọma na ime ka o guzosie ike. N'ihi na Chineke bu onye-àmà nkem, otú agu unu nile nāgusim ike n'obi-ebere nke Kraist Jisus. Nka ka m'nēkpe kwa ekpere, ka ihu-n'anya-unu we nābabiga kwa ókè kari nke-uku nime nmazu na nghọta nile; ka unu we nwa ihe ha na ibe-ha di iche; ka unu we di ọcha n'obi ghara kwa isu ngọngọ rue ubọchi nke Kraist; ebe unu gābu ndi juputaworo na nkpuru nke ezi omume, nke sitere n'aka Jisus Kraist, ka Chineke we nwe ebube na otuto.
Gụọ NDI FILIPAI 1
Geere nke a ntị NDI FILIPAI 1
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: NDI FILIPAI 1:3-11
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị